Nnọọ na Family Radio!

 

Obi dị anyị ụtọ nke ukwu na ị bịaruola na Family Radio! Ịhe nile ị na-ahụ, na-agụ ma ọ bụ na-anụ na websaịtị nke a bụ nke e mebere iji kuziere gị ịhe ma kasikwa gị obi. Ọ bụrụ na ọ bụ mmasị gị ịgụ ịhe ederede nile anyị ma ọ bụ gee ntị n’ozi ndị anyị tinyere n’ígwè okwu, ịhe nile nke anyị wepụtara na websaịtị nke a bụ nke a na-enye n’efù na-anaghị ego.

 

Anyị na-añụrị ọñụ n’onyinye nke nzọpụta nke Chineke, nke Ọ na-enye ndị nke Ya n’efu. Na Family Radio anyị bu ụkpụrụ nke a n’obi we na-ewepụta ịhe nile nke anyị na-enye:…n’efù ka unu natara, nyenụ n’efù. Matiu 10:8. Ya bụ, nnọọ. Ezigbo òhèrè dịrị gị ịwere ịhe nkuzi nile a mụta ịhe, ma ka Chineke gọzikwa gị dịka ị na-agụ ma ọ bụ na-anụ Okwu Ya.

 

Anyị na-ekpe ekpere ka Chineke jiri Okwu Ya meghe anya gị ịhụ Eziokwu. Ka Family Radio bụrụkwa ịhe nkasi obi nakwa agbamume nyere gị dịka ị na-aga ije ma na-ejere Chineke ozi n’ime ụwa a. Ekele dịrị gị!

 
 


Family Stations, Inc – ụlọ ọrụ nke na-adịghị akpa úrù ego 501(c)3 maka ịje ozi – © 2014 Ikike mbipụtagharị nile dịrị anyị